Deuteronomy 7:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n'ọku: enwela anya-uku n'ọla-ọcha na ọla-edo nke di n'aru ha, ewe-kwa-la n'onwe-gi, ka aghara ima gi n'ọnyà nime ya: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.