Deuteronomy 8:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, mere gi ka i je ọgu arọ abua ndia n'ọzara, ka O we weda gi n'ala, inwa gi, ka O we mara ihe nke di n'obi-gi, ma i gēdebe ihe nile O nyere n'iwu, ma-ọbu na i gaghi-edebe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya.