Deuteronomy 9:21 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Nmehie-unu ahu, bú nwa-ehi ahu nke unu mere, m'we were ya sure ya n'ọku, zọpia ya, gwe ya nke-ọma, rue mb͕e ọ mere imurimu dika uzuzu: m'we wuye uzuzu-ya nime miri-iyi nke si n'ugwu ahu nērùdata.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.