Deuteronomy 9:23 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mb͕e Jehova siri na Kedesh-banea ziga unu, si, Rigonu, nweta ala ahu nke M'nyeworo unu; unu we nupu isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu, unu ekweghi kwa Ya, unu egeghi kwa nti n'olu-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.