Deuteronomy 9:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ bughi n'ihi ezi omume-gi, ma-ọbu n'ihi nziri-ezi nke obi-gi, ka gi onwe-gi nābà inweta ala-ha: kama ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi, ka Ọ we me kwa ka okwu ahu guzosie ike nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb.