Ecclesiastes 11:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. Mee ihe niile ị chọrọ ime; gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. Kama, ghọtakwa nke a, na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.