Ecclesiastes 2:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Mu onwem we che ọlum nile nke akam abua luru iru, eche-kwa-ram ndọb͕u nke m'dọb͕uru onwem n'ọlu ime iru: ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe, ọ dighi kwa ihe fọduru madu n'okpuru anyanwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.