Ecclesiastes 4:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.