Ephesians 1:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na site nꞌihe Kraịst meere anyị, anyị abụrụla ndị ga-eso keta ihe ndị ahụ Chineke kwere nkwa inye Kraịst. Nꞌihi na Chineke họpụtara anyị site nꞌoge gara aga ịbụ nke ya. Ihe ndị a ga-emezukwa dị ka ọchịchọ Chineke siri dị.
Igbo 2006
Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya.