Ephesians 1:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na otu a ka ọ dịkwa unu onwe unu. Unu kweere nꞌozi ọma ahụ na-eweta nzọpụta mgbe unu nụrụ ya. Mgbe unu kwekwara, Chineke nyere unu Mmụọ Nsọ ya ka o biri nꞌime unu dị ka akara a kakwasịrị unu igosi na unu bụ ndị nke ya.
Igbo 2006
Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ.