Ephesians 1:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mmụọ Nsọ nọkwa ọnọdụ dị ka ihe akaebe igosi na anyị ga-anata ihe nile Chineke kwere nkwa inye ndị ya. Mmụọ Nsọ a bụkwa ihe ga-eme ka anyị nwee obi siri ike na Chineke ga-arụzu ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ nile bụ nke ya. Ya mere, ka anyị too ebube Chineke.
Igbo 2006
bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.