Ephesians 1:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na leenụ ihe Chineke meere anyị! Tupu o kee ụwa, ọ họpụtara anyị ịbụ ndị nke ya nꞌihi na ọ maara ihe Kraịst ga-emere anyị. Ọ họpụtara anyị ka o nwee ike mee anyị ndị dị nsọ na ndị na-agaghị enwe ịta ụta nꞌihu ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya.
Igbo 2006
dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya.