Ephesians 2:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, chetanụ na unu bụ ndị mba ọzọ site nꞌọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na ndị Juu ndị kpọrọ onwe ha ndị e biri ugwu, na-akpọkwa unu ndị a na-ebighị ugwu, nꞌihi ihe ndị a e mere ha nꞌanụ ahụ. Chetakwanụ ihe unu bụ nꞌoge gara aga.
Igbo 2006
N'ihi nka chetanu, na n'oge gara aga unu onwe-unu, bú ndi mba ọzọ n'anu-aru, ndi ha nākpọ aha Ebìghi-úgwù, bú ndi anākpọ aha Obibì-úgwù, n'anu-aru, nke eji aka me;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie).