Ephesians 2:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. Unu bụ ọbịa nꞌebe ụmụ Izirel ndị Chineke họpụtara nọ. Unu enweghị òke nꞌime ọgbụgba ndụ na nkwa nile Chineke nyere ụmụ Izirel. Unu biri nꞌụwa na-enweghị olileanya, na-enwekwaghị Chineke.
Igbo 2006
na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa.