Ephesians 2:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ kagburu iwu ndị Juu ka o nwee ike mee ndị Juu na ndị mba ọzọ otu agbụrụ ndị e jikọtara ọnụ nꞌime ahụ ya. Site nꞌụzọ dị otu a, o mere ka udo dịrị.
Igbo 2006
ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị.