Ephesians 2:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Site nꞌọnwụ ya nꞌelu obe, o mere ka ekworo dị nꞌetiti ndị Juu na ndị mba ọzọ gwụsịa. Sitekwa nꞌọnwụ ya nꞌobe, o mekwara ha abụọ ka ha bụrụ otu. O sitekwara nꞌụzọ dị otu a mee ka ha bịaghachikwute Chineke.
Igbo 2006
ka O we were kwa obe-Ya me ka ha abua na Chineke di n'otù nime otù aru, ebe O b͕usiri iro ahu nime ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ.