Ephesians 3:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nke a bụkwa ihe omimi ahụ, na unu bụ ndị mba ọzọ ga-esoro ndị Juu keta ngọzi Chineke site nꞌịnụ na ịnabata ozi ọma ya. Na unu na ndị Juu ga-abụ otu anụ ahụ soro keta nkwa Chineke kwere nꞌime Kraịst.
Igbo 2006
bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime Jisọs Kraịst site nʼoziọma.