Ephesians 3:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ee, Chineke nyere m ọrụ a, mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nꞌetiti ụmụ Chineke nile. Ma Chineke họpụtara m ịgwa ndị mba ọzọ ozi ọma banyere agwụghị agwụ nke akụ ebube ahụ pụrụ ịbụ nke ha site nꞌime Kraịst.
Igbo 2006
Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime Kraịst,