Ephesians 4:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụ site na ya ka e mere ka anụ ahụ nile jikọtaa bụrụ otu. Akụkụ nile ọ bụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nꞌụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, na iwuli ha elu site nꞌịhụnanya.
Igbo 2006
Onye aru nile, ebe anēwere nkwonkwo nile ọ bula nke nnyezu kwukọ ya nke-ọma jikọ kwa ya, dika ilusi-ọ1u-ike nke akuku nile ọ bula n'otù n'otù n'ọtùtù-ha si di, aru nile ahu nēsite na Ya nēme ka aru ba uba iwuli onwe-ya elu dika ulo nime ihu-n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya.