Ephesians 4:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, dị ka ndị e jikọtara ha na Onyenwe anyị nꞌotu, ana m agwa unu, na-arịọkwa unu, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị na-amaghị Chineke, ndị echiche ha na-abaghị uru.
Igbo 2006
Ya mere nka ka m'nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n'ihe-efu nke uche-ha,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru.