Ephesians 4:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị obi ha jupụtara nꞌọchịchịrị. Ndị dị otu a enweghị òke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nꞌihi na ha mechiri obi ha nꞌebe Chineke nọ. Ha adịghị aghọtakwa ụzọ ya.
Igbo 2006
n'ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n'èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n'ebe ndu nke Chineke di n'ihi amaghi-ihe di nime ha, n'ihi na anēme ka obi-ha me etili;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa.