Ephesians 4:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihere adịghị eme ha; ihe ọ bụla adịkwaghị emetụ ha nꞌobi. Ha enyefeela onwe ha ime ihe rụrụ arụ nile na-ajụghị ajụjụ banyere ihe ọjọọ ha na-eme.
Igbo 2006
madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n'aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu.