Ephesians 4:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi.
Igbo 2006
Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.