Ephesians 4:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu emela ka obi jọọ Mmụọ Nsọ bi nꞌime unu njọ. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ bụ akara Chineke kwakwasịrị unu igosi na unu bụ nke ya. Ọ nọ dị ka ihe akaebe nke na-egosi na otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka unu nwere onwe unu.
Igbo 2006
Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.