Ephesians 4:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nꞌelu, o duuru igwe ndị a dọtara nꞌagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye.”
Igbo 2006
N'ihi nka Ọ si, Mb͕e Ọ rigoro n'elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n'agha n'agha, Nye kwa madu onyinye di iche iche.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.”