Ephesians 5:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka ahapụ ịkọta akụkọ mmehie ịkwa iko, ma ọ bụ nke adịghị ọcha, ma ọ bụ nke inwe anya ukwu nꞌebe ihe ndị ọzọ nꞌetiti unu nwere dị. Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ya, nꞌihi na omume ọjọọ dị otu a ekwesịghị ụmụ Chineke.
Igbo 2006
Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ.