Ephesians 5:33 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, ọ dị mkpa na nwoke ga-ahụ nwụnye ya nꞌanya dị ka onwe ya. Nwanyị ọ bụla kwesịkwara ịsọpụrụ di ya.
Igbo 2006
Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.