Ephesians 6:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.
Igbo 2006
N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe.