Ephesians 6:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kpeenụ ekpere mgbe nile. Rịọnụ Chineke ihe ọ bụla mgbe ọ bụla Mmụọ Nsọ kwaliri unu ikpe ekpere. Rosiekwanụya arịrịọ ike, na-echetara ya mkpa unu, na-ekpekwa ekpere nꞌihi ndị kwere ekwe nọ nꞌebe nile.
Igbo 2006
site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile.