Ephesians 6:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime.
Igbo 2006
Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n'elu-igwe, ile-madu-anya-n'iru adighi kwa n'ebe Ọ nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ.