Esther 1:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma.