Esther 2:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi.