Esther 2:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n'anya-ya, ewe mere ya ebere n'iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n'ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n'ulo kachasi nma nke ndinyom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi.