Esther 4:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n'aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na ọ nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m.”