Esther 5:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼabalị nke atọ ya, Esta yiri uwe eze nwanyị ya, guzo nʼime ime ogige ụlọeze, nke chere ihu nʼụlọ nzukọ ukwu dị nʼụlọeze, ebe eze nọdụ nʼocheeze ya chee ihu nʼọnụ ụzọ.