Esther 5:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Heman hapụrụ ebe oriri ahụ nʼoke obi ụtọ. Ma mgbe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ama eze, hụkwa na o bilighị maọbụ maa jijiji nʼihu ya, iwe were ya nke ukwuu.