Esther 6:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”