Esther 8:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndeputa odide-akwukwọ, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ndi-Ju nọ na njikere bayere ubọchi a, ibọrọ onwe-ha ọ́bọ̀ n'iru ndi-iro-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha.