Esther 9:28 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
na aganēcheta kwa ubọchi ndia me kwa ememe nime ha n'ọb͕ọ nile ọ bula, na ab͕uru ọ bula, na ala ọ bula anāchi achi, na obodo ọ bula; na ubọchi ndia nke Purim agaghi-esi kwa n'etiti ndi-Ju gabiga, na ncheta-ha agaghi-agwu kwa site na nkpuru-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị Juu aghaghị idebe mmemme ụbọchị Purim, ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile.