Exodus 1:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndinyom nēle ime we si Fero, N'ihi na ndinyom Hibru adighi ka ndinyom Ijipt; n'ihi na ndi nwere ndu ka ha bu, ha nāmu kwa nwa tutu ndinyom nke nēle ime abiakute ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.”