Exodus 12:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.