Exodus 13:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
o rue, mb͕e Fero mere ka o sie ike, bú izipu ayi, na Jehova b͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma nwa madu buru uzọ mu, ma nwa anumanu buru uzọ mu: n'ihi nka ka mu onwem nēwere nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú oké, chuara Jehova àjà; ma ọkpara ọ bula nke umum, anamab͕aputa ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, Onyenwe anyị gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye Onyenwe anyị. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’