Exodus 14:28 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Miri ahu we lata, kpuchie ub͕ọ-ala nile, na ndi-inyinya, bú usu-ndi-agha nile nke Fero, ndi nēso ha n'azu ba nime oké osimiri; ọ dighi ma ọ buná otù onye fọduru nime ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.