Exodus 16:32 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu, si, Ka nju omer nime ya buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu; ka ha we hu nri M'mere ka unu rie n'ọzara, mb͕e M'mere ka unu si n'ala Ijipt puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “ Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’ ”