Exodus 18:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Jetro, bú onye-nchu-àjà Midian, nna nwunye Moses, nuru ihe nile Chineke mere Moses na Israel ndi-Ya, na Jehova mere ka Israel si n'Ijipt puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jetro, nna nwunye Mosis, onye bụkwa onye nchụaja Midia, nụrụ banyere ihe niile Chineke meere Mosis na Izrel ndị nke ya, na ụzọ Onyenwe anyị si napụta Izrel site nʼaka ndị Ijipt.