Exodus 18:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Moses we si n'etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri.