Exodus 19:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jehova we si Moses, Le, Mu onwem nābiakute gi n'igwe-oji b͕ara ọchichiri, ka ndim we nu mb͕e M'nākpa-yere gi uka, ọzọ kwa, ka ọ we buru gi onwe-gi ka ha gēkwere rue mb͕e ebighi-ebi. Moses we gosi Jehova okwu nile nke ndi Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke Onyenwe anyị gwara ya.