Exodus 2:3 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ pughi kwa izobe ya ọzọ, ọ we meere ya ub͕ọ papyrus, were kwa bitumen na pitch te ya; o we tiye nwa ahu nime ya, tiye ya n'etiti ami n'usọ osimiri Nail.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto.