Exodus 22:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Mb͕e onye ọ bula gēzu ehi ma-ọbu aturu, we b͕ue ya, ma-ọbu re ya; ehi ise ka ọ gākwughachi n'ọnọdu ehi ahu, ma-ọbu aturu anọ ka ọ gākwughachi n'ọnọdu aturu ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ bụrụ na mmadụ ezuru ehi maọbụ atụrụ gbuo ya, maọbụ ree ya, ọ ga-akwụghachi ehi ise nʼọnọdụ ehi ahụ. Nʼọnọdụ otu atụrụ o zuuru, ọ ga-akwụghachi atụrụ anọ.