Exodus 22:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya. “Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji.